1 “Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu.
2 Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m
3 Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ,
4 Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ,
5 Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara,
6 “Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara:
7 Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị,
8 Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ.
9 Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa,
10 ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri,
11 Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile.
12 Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile.
13 “Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ,
14 mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị,