1 “Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb,
2 Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ,
3 Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
4 Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike,
5 Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga
6 Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu,
7 Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie.
8 E, ị nụbeghị, ị maghịkwa,
9 Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ
10 Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ.
11 Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a.
12 “Geenụ m ntị, gị Jekọb,
13 Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa.
14 “Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị.
15 Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya;
16 “Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a:
17 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
18 A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile,
19 Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja,
20 Sitenụ na Babilọn pụọ,
21 Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ.
22 Onyenwe anyị sịrị, “Ọ dịghị udo dịrị ndị na-emebi iwu.”