1 Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
2 Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
3 Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
4 Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,
5 Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị.
6 Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha,
7 onye ọbụla nke a na-akpọ aha m,
8 Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ,
9 Mba niile dị iche iche ezukọtala,
10 “Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
11 Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị,
12 Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya,
13 “E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke.
14 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
15 Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị,
16 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
17 Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta,
18 “Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga;
19 Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime.
20 Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m,
21 Ndị m kpụrụ nye onwe m,
22 “Ma unu akpọkughị m, Jekọb,
23 I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ,
24 Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ,
25 “Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu.
26 Chetara m ihe gara aga,
27 Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m.
28 Ya mere, m ji menye ndị a maara aha ha nʼụlọnsọ ihere.