1 “Lee ohu m, onye m na-agba ume,
2 Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa,
3 Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara azọpịa,
4 Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba,
5 Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru,
6 “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m.
7 Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
8 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m.
9 Lee ihe ochie emezuola
10 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya,
11 Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu,
12 Ka ha nye Onyenwe anyị ebube,
13 Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike.
14 “Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị;
15 Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị,
16 Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị,
17 Ma ndị niile na-atụkwasị arụsị obi,
18 “Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri,
19 Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m?
20 Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha.
21 Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu,
22 Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha.
23 Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a?
24 Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe,
25 Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya,