1 Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu!
2 “Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa,
3 Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.
4 Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya,
5 Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu;
6 Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị,
7 Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume.
8 “Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m,
9 Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu,
10 Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
11 “Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere,
12 Unu ga-ele anya ha, chọọ ha,
13 Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
14 Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb,
15 “Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka
16 Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo,
17 “Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa,
18 Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha.
19 Aga m akụ nʼọzara,
20 ka ndị mmadụ hụ, matakwa,
21 “Wepụtanụ mkpesa unu,”
22 “Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị,
23 gwa anyị ihe ọdịnihu ji,
24 Ma unu dị nta karịa ihe efu.
25 “Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa.
26 O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara,
27 Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’
28 Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ.
29 Lee, ha niile bụ ụgha!