1 Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom,
2 Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige,
3 Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.
4 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.
5 Wepụ anya gị nʼebe m nọ,
6 Eze gị dị ka igwe atụrụ
7 Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị
8 E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii,
9 ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.
10 Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,
11 Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi,
12 Tupu m mata ebe m nọ,
13 Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ;