1 Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya,
2 Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ,
3 Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie.
4 Olu gị dị ka ụlọ elu Devid,
5 Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ,
6 Tutu chi ụtụtụ abọọ,
7 Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya,
8 Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ.
9 I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m;
10 Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.
11 Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m,
12 Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ.
13 Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet
14 naad na safron,
15 I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige,
16 Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu;