1 Isaka mụrụ ụmụ anọ:
2 Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a:
3 Uzi mụrụ
4 Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii (36,000), nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
5 Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa (87,000) nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
6 Benjamin mụrụ ndị ikom atọ:
7 Bela mụrụ ụmụ ise:
8 Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ
9 Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ (20,200).
10 Jediael mụrụ otu nwa nwoke:
11 Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha.
12 Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
13 Ụmụ Naftalị mụtara bụ
14 Ụmụ Manase:
15 Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.
16 Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
17 Nwa nwoke Ụlam mụtara
18 Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
19 Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a:
20 Ụmụ Ifrem bụ
21 na Zabad nwa ya,
22 Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi.
23 Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza.
24 Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
25 Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef,
26 onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud,
27 Elishama bụ nna Nun,
28 Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha.
29 Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
30 Asha mụrụ ndị a:
31 Beriya amụta ndị a:
32 Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
33 Ụmụ Jaflet mụrụ bụ
34 Shoma amụọ
35 Nwanne ya nwoke Helem mụrụ
36 Zofa amụta ndị a:
37 Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
38 Jeta mụtara
39 Ụla amụta
40 Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii (26,000), ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.