1 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,
2 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya;
3 Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,
4 Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;
5 Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,
6 Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;
7 Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,
8 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya;
9 Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya;
10 Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”
11 Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ;
12 Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
13 Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa,