1 Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m,
2 Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi;
3 meere m ebere, O Onyenwe m,
4 Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m,
5 Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m,
6 O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m;
7 Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị,
8 Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m;
9 Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị,
10 Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche;
11 Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị,
12 Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m;
13 Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu;
14 O Chineke, ndị mpako na-emegide m;
15 Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,
16 Chee m ihu, mekwaara m amara.
17 Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị,