1 Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka;
2 Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ.
3 O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude;
4 I kweghị ka anya m abụọ mechie;
5 Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga,
6 Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị.
7 “Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi?
8 Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla?
9 Chineke, o chefuola i mere anyị ebere?
10 Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m,
11 Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;
12 Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,
13 O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ.
14 Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;
15 I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị,
16 Osimiri hụrụ gị, O Chineke,
17 Igwe ojii wụpụrụ mmiri,
18 A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe,
19 Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara,
20 I sitere nʼaka Mosis na Erọn