1 O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m,
2 Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe,
3 Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ!
4 Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m.
5 Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile,
6 Nʼanyasị, ha na-alaghachi,
7 Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta,
8 Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị;
9 O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị;
10 Chineke m, onye m tụkwasịrị obi.
11 O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha,
12 Ka e jide ha nʼime nganga ha,
13 jiri iwe ọkụ repịa ha,
14 Nʼanyasị ha na-alaghachi;
15 Ha na-awagharị na-achọ nri,
16 Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,
17 O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto;