1 Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto,
2 Ọ mara mma nʼịdị elu ya,
3 Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike;
4 Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ,
5 ihe ha hụrụ juru ha anya;
6 Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ,
7 Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ
8 Dịka anyị nụrụ,
9 O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị,
10 O Chineke, dịka aha gị,
11 Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ,
12 Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu,
13 Lezienụ mgbidi ya niile anya,
14 Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi,