1 Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe,
2 Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ,
3 Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ;
4 Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m
5 Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi
6 Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala
7 Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu
8 Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa.
9 O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m;
10 Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m,
11 Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m,
12 Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya,
13 Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla,
14 Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe,
15 O Onyenwe anyị, ana m eche gị;
16 Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m;
17 Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada.
18 Ana m ekwupụta mmehie m;
19 Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ,
20 Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe,
21 O Onyenwe anyị, ahapụkwala m;
22 Bịa ọsịịsọ inyere m aka