1 Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?
2 O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m,
3 Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;
4 Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi;
5 Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara;
6 Abụ m idide, abụghị m mmadụ;
7 Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;
8 “O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi;
9 Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.
10 Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.
11 Anọla m ebe dị anya,
12 Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;
13 Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa
14 A wụpụla m dịka mmiri,
15 Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.
16 Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;
17 A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;
18 Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,
19 Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya;
20 Napụta ndụ m site na mma agha,
21 Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a,
22 Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;
23 Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;
24 Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya
25 Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị;
26 Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,
27 Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,
28 Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,
29 Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;
30 Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;
31 Ha ga-ekwusa ezi omume ya