1 O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị.
2 I nyela ya ihe obi ya chọrọ;
3 I ji ngọzị bara ụba nabata ya,
4 Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya
5 Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya,
6 Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
7 Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,
8 Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile;
9 Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ,
10 Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi,
11 Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị,
12 Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ
13 O Onyenwe anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị;