1 Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya.
2 Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto;
3 Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya;
4 Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
5 Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ,
6 unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya,
7 Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị;
8 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi,
9 ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara
10 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,
11 “Aga m enye gị ala Kenan
12 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,
13 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ,
14 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;
15 sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka;
16 O zitere ụnwụ nʼala ahụ,
17 o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha,
18 Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ,
19 tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru,
20 Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya,
21 O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya,
22 ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya,
23 Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt;
24 Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu;
25 ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị,
26 O zipụrụ Mosis, ohu ya,
27 Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha,
28 O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị,
29 O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara,
30 Ala ha niile jupụtara nʼawọ
31 O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta
32 Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha
33 o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha,
34 O kwuru okwu, igurube na ụkpana
35 ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ,
36 Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ,
37 Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo,
38 Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ,
39 Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi,
40 Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel,
41 O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara;
42 Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ,
43 O ji aṅụrị dupụta ndị ya,
44 o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche,
45 ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile