1 Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri,
2 tụkwasị mma nʼakpịrị gị,
3 Achọsila nri ụtọ ya ike,
4 Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya,
5 Nʼihi na akụ nwere ike ifu
6 Erila nri onye aka ntagide na-enye gị.
7 Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ
8 Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri
9 Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu,
10 Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya
11 nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike;
12 Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị;
13 Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị.
14 Jiri mkpara tie ya ihe
15 Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu
16 Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ
17 Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo,
18 nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị.
19 Nwa m, nwee uche,
20 Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke,
21 nʼihi na ihe niile ga-akọ ha.
22 Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị,
23 Zụta eziokwu, erekwala ya,
24 Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ.
25 Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ.
26 Nwa m, nye m obi gị
27 Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi,
28 Dịka onye ohi ka ọ na-echere
29 Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ?
30 Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya,
31 Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara,
32 Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ
33 Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya,
34 Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri,
35 Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ.