1 Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
2 Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka,
3 nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche,
4 Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche,
5 Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara,
6 Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile
7 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.
8 Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
9 Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
10 Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra,
11 Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị,
12 Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili,
13 Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa,
14 Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị,
15 Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a,
16 nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ,
17 Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ,
18 Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha.
19 Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi.
20 Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ.
21 Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku,
22 “Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya?
23 Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,
24 Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku,
25 ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị,
26 ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị.
27 Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike,
28 “Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m.
29 Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị,
30 Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m.
31 Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta.
32 Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha,
33 Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi.