Números 33
IBO vs NTLH
1 Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a.
1 São estas as caminhadas dos israelitas que saíram do Egito, grupo por grupo, debaixo das ordens de Moisés e Arão.
2 Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
2 Moisés ia anotando os nomes dos lugares de onde partiam, de acordo com as ordens de Deus, o Senhor . E são estas as caminhadas conforme os lugares de partida:
3 Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
3 O povo de Israel saiu do Egito no dia quinze do primeiro mês do ano, um dia depois da primeira Páscoa . Eles saíram de Ramessés de maneira vitoriosa, e todos os egípcios os viram.
4 mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
4 Os egípcios estavam sepultando os seus primeiros filhos que o Senhor havia matado. Assim, o Senhor mostrou que era mais poderoso do que os deuses do Egito.
5 Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
5 Depois de saírem de Ramessés, os israelitas acamparam em Sucote.
6 Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
6 Saíram de Sucote e acamparam em Etã, que está na beira do deserto.
7 Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol.
7 Saíram de Etã e voltaram a Pi-Hairote, que fica a leste de Baal-Zefom, e acamparam perto de Migdol.
8 Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara.
8 Saíram de Pi-Hairote e passaram pelo meio do mar Vermelho e chegaram ao deserto de Sur. Caminharam três dias no deserto e acamparam em Mara.
9 Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a.
9 Dali foram para Elim e acamparam ali. Em Elim havia doze fontes de água e setenta palmeiras.
10 Mgbe ha hapụrụ Elim, ha wuru ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
10 Saíram de Elim e acamparam perto do golfo de Suez.
11 Emesịa, ha hapụrụ Osimiri Uhie gaa maa ụlọ ikwu ha nʼọzara a na-akpọ Sin.
11 Partiram dali e acamparam no deserto de Sim.
12 Ha hapụrụ ọzara Sin gaa maa ụlọ ikwu ha na Dofka.
12 Dali foram até Dofca, onde acamparam.
13 Emesịa, ha hapụrụ Dofka bịaruo Alush maa ụlọ ikwu ha.
13 Partiram de Dofca e acamparam em Alus.
14 Mgbe ha hapụrụ Alush, ha rutere Refidim, ebe ndị Izrel na-ahụghị mmiri ọṅụṅụ.
14 Depois de Alus, acamparam em Refidim. Porém ali não havia água para o povo beber.
15 Ha hapụrụ Refidim bịaruo nʼọzara Saịnaị ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
15 — ausente —
16 Ha hapụrụ ọzara Saịnaị bịaruo Kibrọt Hataava ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
16 — ausente —
17 Ha hapụrụ Kibrọt Hataava bịaruo Hazerọt ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
17 — ausente —
18 Ha hapụrụ Hazerọt bịaruo Ritma ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
18 — ausente —
19 Ha hapụrụ Ritma bịaruo Rimon-Perez ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
19 — ausente —
20 Ha hapụrụ Rimon-Perez bịaruo Libna ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
20 — ausente —
21 Ha hapụrụ Libna bịaruo Rissa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
21 — ausente —
22 Ha hapụrụ Rissa bịaruo Kehelata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
22 — ausente —
23 Ha hapụrụ Kehelata bịaruo nʼugwu Shefa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
23 — ausente —
24 Ha hapụrụ ugwu Shefa bịaruo Harada ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
24 — ausente —
25 Ha hapụrụ Harada bịaruo Makhelot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
25 — ausente —
26 Ha hapụrụ Makhelot bịaruo Tahat ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
26 — ausente —
27 Ha hapụrụ Tahat bịaruo Tera ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
27 — ausente —
28 Ha hapụrụ Tera bịaruo Mitka ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
28 — ausente —
29 Ha hapụrụ Mitka bịaruo Hashmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
29 — ausente —
30 Ha hapụrụ Hashmona bịaruo Moserot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
30 — ausente —
31 Ha hapụrụ Moserot bịaruo Bene Jaakan ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
31 — ausente —
32 Ha hapụrụ Bene Jaakan bịaruo Họ Hagịdgad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
32 — ausente —
33 Ha hapụrụ Họ Hagịdgad bịaruo Jotbata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
33 — ausente —
34 Ha hapụrụ Jotbata bịaruo Abrona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
34 — ausente —
35 Ha hapụrụ Abrona bịaruo Eziọn Geba ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
35 — ausente —
36 Ha hapụrụ Eziọn Geba bịa maa ụlọ ikwu ha na Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.
36 — ausente —
37 Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm.
37 — ausente —
38 Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta.
38 Por ordem de Deus, o Senhor , o sacerdote Arão subiu o monte Hor. E morreu ali, no dia primeiro do quinto mês, quarenta anos depois que os israelitas tinham saído do Egito.
39 Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor.
39 Arão tinha cento e vinte e três anos de idade quando morreu.
40 Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa.
40 Então o rei cananeu de Arade, que morava na região sul da terra de Canaã, soube que os israelitas estavam chegando.
41 Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
41 — ausente —
42 Ha hapụrụ Zalmona bịaruo Punon ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
42 — ausente —
43 Ha hapụrụ Punon bịaruo Obot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
43 — ausente —
44 Ha hapụrụ Obot bịaruo Iye Abarim, nʼoke ala ndị Moab.
44 — ausente —
45 Ha hapụrụ Iye Abarim bịaruo Dibọn Gad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
45 — ausente —
46 Ha hapụrụ Dibọn Gad bịaruo Almon Diblataim ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
46 — ausente —
47 Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
47 — ausente —
48 Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
48 — ausente —
49 Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.
49 — ausente —
50 Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya,
50 Nas planícies de Moabe, junto ao rio Jordão, na altura de Jericó, que ficava no outro lado do rio, o Senhor mandou que Moisés desse
51 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan,
51 aos israelitas as seguintes ordens: — Quando vocês atravessarem o rio Jordão e entrarem na terra de Canaã,
52 unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe.
52 expulsem todos os moradores daquela terra. Destruam todos os seus ídolos de metal e de pedra e todos os seus lugares de adoração.
53 Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya.
53 Tomem posse da terra e morem nela porque eu a estou dando a vocês.
54 Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.
54 Repartam a terra, por sorteio , entre as tribos e os grupos de famílias. Aos grupos de famílias mais numerosos deem uma parte maior; e aos grupos menos numerosos deem uma parte menor.
55 “ ‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị niile bi nʼala ahụ, ndị unu hapụrụ ga-abụrụ unu iberibe unyi nʼanya unu. Ha ga-adịkwara unu ka ogwu nke ga-adụkasị unu ahụ. Ha ga-enye unu nsogbu nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya.
55 Porém, se vocês não expulsarem os moradores do país, os que ficarem serão para vocês como espinhos nos seus olhos e como ferrões nas suas costas e trarão problemas para vocês na terra em que vocês morarem.
56 Mgbe ahụ kwa, aga m emeso unu ụdị mmeso ahụ m na-akwado imeso ha ugbu a.’ ”
56 E farei com vocês tudo o que eu havia pensado fazer com eles.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?