Números 2

IBO vs BKJ

Sair da comparação
1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha,
1 E o SENHOR falou a Moisés e a Arão, dizendo:
2 “Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”
2 Cada filho de Israel armará a sua tenda, junto à sua própria bandeira, com as insígnias da casa de seus pais; ao redor do tabernáculo da congregação armarão suas tendas.
3 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ,
3 E do lado do oriente, o lado do sol nascente, armarão suas tendas os da bandeira de Judá, segundo os seus exércitos; e Naassom, filho de Aminadabe, será o capitão dos filhos de Judá.
4 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii (74,600)
4 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram setenta e quatro mil e seiscentos.
5 Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua.
5 E a tribo de Issacar acampará próximo a ele, e Natanael, o filho de Zuar, será o capitão dos filhos de Issacar.
6 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).
6 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram cinquenta e quatro mil e quatrocentos.
7 Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn.
7 Depois a tribo de Zebulom, e Eliabe, filho de Helom, será o capitão dos filhos de Zebulom.
8 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).
8 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram cinquenta e sete mil e quatrocentos.
9 Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ (186,400). Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.
9 Todos os que foram contados no acampamento de Judá, eram cento e oitenta e seis mil e quatrocentos, segundo os seus exércitos, e esses marcharão primeiro.
10 Nʼakụkụ ndịda ka
10 No lado sul estará a bandeira de Rúben, segundo os seus exércitos; e o capitão dos filhos de Rúben será Elizur, o filho de Sedeur.
11 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).
11 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram quarenta e seis mil e quinhentos.
12 Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai.
12 E ao seu lado acampará a tribo de Simeão, e o capitão dos filhos de Simeão será Selumiel, filho de Zurisadai.
13 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).
13 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram cinquenta e nove mil e trezentos.
14 Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.
14 Depois a tribo de Gade; e o capitão dos filhos de Gade será Eliasafe, filho de Deuel.
15 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650).
15 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram quarenta e cinco mil e seiscentos e cinquenta.
16 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise (151,450) dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
16 Todos os que foram contados no acampamento de Rúben, eram cento e cinquenta e um mil e quatrocentos e cinquenta, segundo os seus exércitos, e esses marcharão na segunda fila.
17 Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.
17 A seguir, partirá o tabernáculo da congregação, com o acampamento dos levitas, no meio do acampamento; da mesma maneira como acamparam, também marcharão, cada homem em seu lugar, segundo suas bandeiras.
18 Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ
18 No lado do ocidente, estará a bandeira do exército de Efraim, segundo os seus exércitos; e o capitão dos filhos de Efraim será Elisama, filho de Amiúde.
19 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
19 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram quarenta mil e quinhentos.
20 Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo.
20 E ao seu lado estará a tribo de Manassés, e o capitão dos filhos de Manassés será Gamaliel, o filho de Pedazur.
21 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).
21 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram trinta e dois mil e duzentos.
22 Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn.
22 A seguir, virá a tribo de Benjamim: e o capitão dos filhos de Benjamim será Abidã, filho de Gideoni.
23 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400).
23 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram trinta e cinco mil e quatrocentos.
24 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ (108,100). Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
24 Todos os que foram contados no acampamento de Efraim, eram cento e oito mil e cem, segundo os seus exércitos, e marcharão na terceira fila.
25 Ebo Dan na usuu ndị agha ha
25 A bandeira do exército de Dã estará no lado norte, ao lado de seus exércitos; e o capitão dos filhos de Dã será Aiezer, filho de Amisadai.
26 Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700).
26 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram sessenta e dois mil e setecentos.
27 Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran.
27 E a seu lado acampará a tribo de Aser; e o capitão dos filhos de Aser será Pagiel, filho de Ocrã.
28 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).
28 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram quarenta e um mil e quinhentos.
29 Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan.
29 A seguir, virá a tribo de Naftali; e o capitão dos filhos de Naftali será Aira, filho de Enã.
30 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
30 E o seu exército, e os que foram contados deles, eram cinquenta e três mil e quatrocentos.
31 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.
31 Todos os que foram contados no acampamento de Dã foram cento e cinquenta e sete mil e seiscentos, e esses marcharão na última fila, com as suas bandeiras.
32 Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ.
32 Estes são os que foram contados dos filhos de Israel, segundo a casa de seus pais; todos os que foram contados dos acampamentos, segundo os seus exércitos, eram seiscentos e três mil quinhentos e cinquenta.
33 Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
33 Porém, os levitas não foram contados entre os filhos de Israel, como o SENHOR ordenara a Moisés.
34 Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.
34 E os filhos de Israel assim fizeram, segundo tudo o que o SENHOR ordenara a Moisés; assim, acamparam ao lado de suas bandeiras, e assim marcharam, cada um segundo suas famílias, de acordo com a casa de seus pais.

Ler em outra tradução

Comparar com outra