Números 23

IBO

1 Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.”

2 Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu.

3 Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị.

4 Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.”

5 Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”

6 Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile.

7 Nke a bụ ozi Belam ziri:

8 M ga-esi aṅaa bụọ

9 Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha.

10 Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?

11 Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”

12 Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”

13 Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”

14 Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.

15 Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”

16 Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.”

17 Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?”

18 Ma Belam zaghachiri sị ya:

19 Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.

20 Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.

21 “O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb,

22 Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt.

23 Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha.

24 Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm,

25 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”

26 Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”

27 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”

28 Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya.

29 Belam gwara Balak okwu sị ya, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa ọzọ. Doziekwa ụmụ oke ehi asaa na ebule asaa e ji achụ aja.”

30 Balak mere dịka Belam gwara ya. O ji otu oke ehi na otu ebule chụọ aja nʼebe ịchụ aja ahụ nʼotu na otu.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado