Números 12
IBO vs NVT
1 Miriam na Erọn malitere ikwu okwu megide Mosis, nʼihi na ọ lụrụ nwunye onye Kush.
1 Miriã e Arão criticaram Moisés porque ele havia se casado com uma mulher cuxita.
2 Ha kwuru sị, “Ọ bụ naanị site nʼọnụ Mosis ka Onyenwe anyị si agwa ndị ya okwu? Ọ naghị esitekwa nʼọnụ anyị kwuo okwu?” Onyenwe anyị nụrụ ihe ndị a ha kwuru.
2 Disseram: “Acaso o S enhor fala apenas por meio de Moisés? Também não falou por meio de nós?”. E o S enhor ouviu isso.
3 (Ma nwoke ahụ bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu karịa onye ọbụla nọ nʼelu ala.)
3 (Ora, Moisés era muito humilde, mais que qualquer outra pessoa na terra.)
4 Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara.
4 No mesmo instante, o S enhor chamou Moisés, Arão e Miriã e disse: “Vão à tenda do encontro, vocês três!”, e eles foram para lá.
5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso.
5 Então o S enhor desceu na coluna de nuvem e parou à entrada da tenda de encontro. “Arão e Miriã!”, chamou ele. Os dois se aproximaram,
6 Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a:
6 e o S enhor lhes disse: “Ouçam o que vou dizer: “Se houver profeta entre vocês, eu, o S falarei com ele em sonhos.
7 Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị,
7 Não é assim, porém, com meu servo Moisés; ele tem sido fiel em toda a minha casa.
8 Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu
8 Falo com ele face a face, claramente, e não por meio de enigmas; ele vê a forma do S Como vocês ousaram criticar meu servo Moisés?”.
9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ.
9 A ira do S enhor se acendeu contra eles, e ele se retirou.
10 Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta,
10 Enquanto a nuvem se afastava da tenda, Miriã ficou ali, com a pele branca como a neve, leprosa. Quando Arão viu o que havia acontecido com ela,
11 ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee.
11 clamou a Moisés: “Ó meu senhor! Por favor, não nos castigue pelo pecado que insensatamente cometemos.
12 Ekwela ka Miriam dịrị ka nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ nke akpụkpọ ahụ ya rere ure nʼoge o si nʼakpanwa nne ya na-apụta.”
12 Não permita que ela fique como um bebê que nasce morto, já em decomposição”.
13 Ya mere Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị ya, “Chineke, biko, gwọọ ya!”
13 Então Moisés clamou ao S enhor : “Ó Deus, eu suplico que a cures!”.
14 Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, “Ọ bụrụ na nna ya gbụrụ ya asụ nʼihu, ọ gaghị abụ onye rụrụ arụ abalị asaa? Ya mere, hapụ ya ka ọ bụrụ onye e sitere nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel wezuga abalị asaa. Mgbe oge a gafesịrị, o nwere ike ịlọghachi.”
14 O S enhor respondeu a Moisés: “Se o pai de Miriã tivesse apenas cuspido no rosto dela, não ficaria contaminada por sete dias? Portanto, mantenham-na fora do acampamento por sete dias. Depois disso, ela poderá ser aceita de volta”.
15 Ya mere e wezugara Miriam site nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel abalị asaa. Ndị Izrel niile nọdụrụ chere ya ruo mgbe ọ lọghachiri, tutu ha ebilie nʼije ọzọ.
15 Miriã foi mantida fora do acampamento por sete dias, e o povo esperou até ela ser trazida de volta para seguir viagem.
16 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha hapụrụ Hazerọt rute nʼọzara Paran ebe ha wuru ogige ụlọ ikwu ha.
16 Então saíram de Hazerote e acamparam no deserto de Parã.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?