1 Ahụhụ dịrị obodo ọbara,
2 Ụda ụtarị,
3 Ndị agha ịnyịnya,
4 Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko,
5 “Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
6 Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche,
7 Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị,
8 Ị dị mma karịa Tibs,
9 Kush na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ,
10 Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ
11 Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,
12 Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig
13 Lee ndị agha gị,
14 Seta mmiri maka oge nnọchibido,
15 Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị,
16 Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ,
17 Ndị nche gị bara ụba igurube,
18 Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ gị na-ero ụra,
19 Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa.