1 Abụ m onye hụrụla ahụhụ site
2 O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa
3 Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m,
4 O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ,
5 O busola m agha,
6 O meela ka m biri nʼọchịchịrị
7 Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ;
8 Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya,
9 O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile,
10 Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche,
11 o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ,
12 Ọ dọọla ụta ya
13 O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya
14 Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile;
15 O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ,
16 O meela ka m jiri okwute tajisie eze m,
17 Enweghị m udo,
18 Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa.
19 Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m,
20 Mgbe m na-echeta ya,
21 Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m
22 Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,
23 Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;
24 Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m,
25 Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,
26 Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ
27 Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya
28 Ya nọrọkwa duu naanị ya,
29 Ya tinye ihu ya nʼaja,
30 Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya,
31 Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo
32 Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya,
33 Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ,
34 Iji ụkwụ zọgbuo
35 ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka
36 ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ.
37 Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire
38 Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu
39 Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu
40 Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya.
41 Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye
42 “Anyị emehiela, nupu isi,
43 “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ.
44 I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị
45 I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ
46 “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha
47 Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche,
48 Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta
49 Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta
50 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe
51 Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu,
52 Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla,
53 Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu
54 Mmiri kpuchiri m isi,
55 Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị,
56 Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị.
57 Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị.
58 Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m,
59 Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m.
60 Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile
61 Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m
62 Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m
63 Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala.
64 Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha,
65 Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha.
66 Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị,