1 Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta;
2 Ọ gaara adị m mma
3 “Ha na-ekwe ire ha dịka ụta,
4 “Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ.
5 Enyi na-aghọgbu enyi ya,
6 I bi nʼetiti aghụghọ.
7 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
8 Ire ha na-egbu dịka àkụ.
9 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị,
10 Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa.
11 “Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi.
12 Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?
13 Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.
14 Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.”
15 Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi.
16 Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.”
17 Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
18 Ha bịa ngwangwa
19 Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn
20 Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị,
21 Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị
22 Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
23 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
24 kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a:
25 “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ.
26 Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”