Jeremias 51

IBO

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

2 Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn,

3 Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya,

4 Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn,

5 Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma,

6 “Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ.

7 Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị.

8 Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya.

9 “ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn,

10 “ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè.

11 “Mụọnụ ọnụ àkụ unu;

12 Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn.

13 Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri,

14 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị,

15 “O sitere nʼike ya mee ụwa;

16 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.

17 “Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.

18 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,

19 Ma onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,

20 “Ị bụ mkpọrọ osisi m ji ebu agha,

21 gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya,

22 gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị,

23 gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya,

24 “Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.

25 “Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe,

26 A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ,

27 “Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ.

28 Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha,

29 Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu,

30 Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ;

31 Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya,

32 na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi,

33 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,

34 “Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị,

35 Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.”

36 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,

37 Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,

38 Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm,

39 Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha,

40 “Aga m akpụdata ha,

41 “Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha,

42 Osimiri ga-eri Babilọn,

43 Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu,

44 Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ,

45 “Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m!

46 Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ,

47 Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa

48 mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha

49 “Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu,

50 Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ,

51 “Ihere emeela anyị,

52 “Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,

53 A sịkwarị na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe,

54 “Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta,

55 Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi.

56 Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha.

57 Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke;

58 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

59 Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya.

60 Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn.

61 Ọ sịrị Seraya, “Mgbe i ruru Babilọn, lezie anya hụ na ị gụpụtara okwu ndị a niile ebe ndị mmadụ ga-anụ ya.

62 Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’

63 Mgbe ị gụsịrị ihe dị nʼakwụkwọ a, kegide ya nkume, tụnye ya nʼetiti iyi ukwu Yufretis.

64 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka Babilọn ga-esi mikpuo. Ọ gaghị ebilikwa ọzọ, nʼihi ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ya. Ndị ya ga-adakwa.’ ”

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado