1 “Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.”
2 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
3 Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,
4 Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,
5 Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige
6 Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ
7 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
8 Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;
9 Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,
10 “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;
11 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,
12 Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,
13 Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,
14 Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta,
15 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
16 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
17 Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.”
18 “Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị,
19 Mgbe m kpafuru,
20 Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,
21 “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,
22 Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,
23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’
24 Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha.
25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”
26 Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
27 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.
28 Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
29 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,
30 Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.
31 “Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
32 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ
33 “Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba
34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
36 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
37 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
38 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ.
39 Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa.
40 Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”