1 Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
2 “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ.
3 Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”
4 Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda.
5 “Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
6 Jụọnụ ajụjụ, ma hụ,
7 Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ.
8 “ ‘Nʼụbọchị ahụ,’
9 Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha,
10 “ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
11 Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’
12 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara,
13 O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,
14 Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;
15 Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?
16 “ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;
17 Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;
18 “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
19 Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele,
20 Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ,
21 Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha;
22 ‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m,
23 Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya
24 Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị