1 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ.
2 Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
3 “Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
4 Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.
5 “Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?
6 Gị onwe gị ajụla m,”
7 Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha
8 Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba.
9 Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,
10 Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m,
11 Onyenwe anyị kwuru sị,
12 “Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe,
13 “Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị,
14 Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị.
15 Ị maara O Onyenwe anyị,
16 Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.
17 O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.
18 Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?
19 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
20 Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ.
21 “Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ.