Isaías 38

IBO

1 Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”

2 Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị,

3 “Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.

4 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya,

5 “Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị.

6 Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.

7 “ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.

8 Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.

9 Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:

10 Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa

11 Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ

12 Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m

13 Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.

14 Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.

15 Ma gịnị ka m ga-ekwu?

16 Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.

17 Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,

18 Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,

19 Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,

20 Onyenwe anyị ga-azọpụta m,

21 Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”

22 Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado