Isaías 37

IBO

1 Mgbe eze Hezekaya nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

2 O zipụrụ Eliakịm, onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.

3 Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.

4 Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”

5 Mgbe ndị ọrụ eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,

6 ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.

7 Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ”

8 Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.

9 Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Mgbe ọ nụrụ nke a, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,

10 “Gwanụ Hezekaya, eze Juda: Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’

11 Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?

12 Chi niile nke mba niile, ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden ndị nọ na Tel Asa?

13 Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze ndị Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”

14 Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.

15 Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị:

16 “O, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.

17 Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu niile ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.

18 “Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu,

19 ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.

20 Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị bụ Chineke, na ọ dịkwaghị chi ọzọ ma ọ bụghị gị.”

21 Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa,

22 nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya.

23 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa?

24 I sitere nʼaka ndị ozi gị

25 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ,

26 “Ọ bụ na ị nụbeghị?

27 Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere,

28 “Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ,

29 Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,

30 “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama nye gị, Hezekaya.

31 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda

32 Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta,

33 “Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa.

34 Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi;

35 “Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m,

36 Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.

37 Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.

38 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado