1 Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi,
2 Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ,
3 Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị.
4 Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi,
5 Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu.
6 Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile,
7 Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile;
8 Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla.
9 Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu.
10 Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.”
11 Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ,
12 Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ;
13 Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya!
14 Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu,
15 Ndị na-ejegharị nʼezi omume
16 Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu,
17 Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya;
18 Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga.
19 Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ,
20 Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile;
21 Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike.
22 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị.
23 A tọsaala ụdọ niile:
24 Ọ dịkwaghị onye bi na Zayọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,”