Isaías 32

IBO

1 Lee, eze ga-achị nʼezi omume na-abịa,

2 Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe,

3 Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ,

4 Ọ bụladị obi ndị nzuzu nʼetiti ha ga-ejupụta nʼakọnuche na nghọta,

5 Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe.

6 Nʼihi na ndị nzuzu na-ekwu okwu na-echeghị echiche,

7 Ndị ọjọọ na-eji ụzọ aghụghọ niile eme ihe ọjọọ,

8 Ma onye a na-asọpụrụ na-atụpụta atụmatụ dị ezi mma,

9 Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru,

10 Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị,

11 Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru,

12 Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju,

13 Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu.

14 Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike,

15 Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ.

16 A ga-emekwa ka ikpe ziri ezi ga-ebi nʼọzara,

17 Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo;

18 Ndị m ga-ebi nʼebe obibi nke udo,

19 A sikwa na mkpụrụ mmiri ezoo nʼoke ọhịa niile,

20 ndị a gọziri agọzi ka unu ga-abụ,

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado