1 Nke a bụ amụma megide Damaskọs, isi obodo Siria.
2 Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea,
3 Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa,
4 “Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala.
5 Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ,
6 Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa,
7 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha,
8 Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka.
9 Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.
10 Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.
11 ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
12 Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme,
13 Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri,
14 Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị,