1 Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.
2 Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.
3 Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;
4 Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;
5 Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya
6 Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,
7 Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,
8 Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.
9 Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,
10 Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu
11 Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,
12 Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
13 Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,
14 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.
15 Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,
16 A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;
17 Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;
18 Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;
19 Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,
20 Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
21 Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.
22 A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.