Isaías 13

IBO

1 Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.

2 Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.

3 Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;

4 Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;

5 Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya

6 Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,

7 Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,

8 Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.

9 Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,

10 Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu

11 Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,

12 Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,

13 Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,

14 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.

15 Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,

16 A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;

17 Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;

18 Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;

19 Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,

20 Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.

21 Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.

22 A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado