1 Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi;
2 Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya,
3 Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị.
4 Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe;
5 Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume,
6 Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo;
7 Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe,
8 Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala;
9 Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe,
10 Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
11 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.
12 Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ
13 Ekworo Ifrem ga-akwụsị,
14 Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha;
15 Onyenwe anyị ga-eme
16 Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ