Deuteronômio 32

IBO

1 Gee ntị, gị eluigwe, nụrụ ihe m na-ekwu!

2 Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo

3 Aga m eto aha Onyenwe anyị

4 Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke,

5 Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya,

6 Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị

7 Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga,

8 Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha,

9 Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya

10 Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya,

11 dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya,

12 Onyenwe anyị naanị ya duru ya,

13 O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ,

14 na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ,

15 Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya,

16 Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya,

17 Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke,

18 Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,

19 Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha,

20 “Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru,

21 Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m,

22 Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m,

23 “Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha,

24 Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha,

25 Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,

26 Ekwuru m na m ga-achụsasị ha,

27 Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi,

28 Ha bụ mba na-enweghị uche,

29 A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche

30 Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,

31 Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị,

32 Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm,

33 Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ,

34 “Nke a ọ bụghị ihe m dokọtarala chere oge,

35 Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi.

36 Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe,

37 Ọ ga-asịkwa, “Ugbu a, olee ebe chi niile ha nọ,

38 chi ndị ahụ riri abụba ihe ịchụ aja ha,

39 “Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya!

40 Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị,

41 mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma,

42 Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ,

43 Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya,

44 Mosis na Joshua nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel.

45 Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel,

46 ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a.

47 Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.”

48 Nʼotu ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

49 “Bilie ga nʼugwu Nebo nke dị nʼetiti ugwu Abarim, nʼala Moab, na ncherita ihu Jeriko, leekwa ala Kenan anya, bụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.

50 Mgbe ị hụsịrị ala a, ị ga-anwụ nʼebe ahụ nʼelu ugwu ahụ, lakwurukwa nna nna gị ha, dịka Erọn nwanne gị si nwụọ nʼugwu Hor, lakwuru ha.

51 Nʼihi na gị na Erọn jụrụ irubere m isi nʼihu ụmụ Izrel, na mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin, unu edoghị m nsọ nʼihu ndị Izrel.

52 Nʼihi ya, ị ga-esite nʼebe dị anya hụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel, ma ị gaghị aba nʼime ya.”

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado