1 Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn,
2 Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya,
3 Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ
4 Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi,
5 Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara,
6 Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba;
7 Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ.
8 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị,
9 Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ.
10 Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”
11 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu.
12 Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume?
13 Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba,
14 “Ma lee, aghaghị m ime ka otu mba bilie imegide unu, ụlọ Izrel,”