Salmos 89

IBO

1 Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi;

2 Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

3 Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ.

4 ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi

5 O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile,

6 Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị?

7 Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu;

8 O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị?

9 Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;

10 Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;

11 Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,

12 Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;

13 Aka gị ka e mejupụtara nʼike;

14 Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị;

15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ,

16 Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile;

17 Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha,

18 Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị,

19 I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ,

20 Achọtala m Devid ohu m,

21 Aka m ga-agba ya ume;

22 Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede;

23 Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya.

24 Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya,

25 M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,

26 Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m,

27 Aga m eme ya nwa mbụ m,

28 Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi,

29 Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,

30 “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya,

31 ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya,

32 aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha,

33 ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ.

34 Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m.

35 Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie

36 na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

37 Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa.

38 Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa,

39 Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara

40 Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu,

41 Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere.

42 I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu;

43 I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ,

44 I meela ka ịma mma ya gwụsịa.

45 I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ.

46 Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị?

47 Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa.

48 Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya,

49 O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị,

50 Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya,

51 O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo,

52 Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado