Salmos 81

IBO

1 Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ,

2 Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu,

3 Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ,

4 nke a bụ iwu dịrị Izrel,

5 O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef

6 “Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha;

7 Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu,

8 “Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị,

9 Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu;

10 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,

11 “Ma ndị m ekweghị ige m ntị.

12 Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha,

13 “Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị,

14 Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha.

15 Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ.

16 Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ;

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado