1 O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.
2 Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,
3 Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;
4 Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,
5 Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,
6 Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,
7 Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;
8 Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,
9 Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya,
10 Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya,
11 Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya,
12 Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.
13 Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,
14 Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,
15 Ka ọ dị ogologo ndụ!
16 Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;
17 Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
18 Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,
19 Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;
20 Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.