Salmos 55

IBO

1 O Chineke, nụrụ ekpere m,

2 ṅaa m ntị, zaakwa m.

3 nʼihi ihe onye iro m na-ekwu,

4 Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;

5 Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;

6 Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru!

7 Agaara m efelaga ebe dị anya,

8 Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m,

9 O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu,

10 Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya;

11 A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo;

12 A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị,

13 Maọbụ gị, nwoke dịka m,

14 onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ,

15 Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede;

16 Ma akpọkuru m Chineke,

17 Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị,

18 Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,

19 Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,

20 Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,

21 Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta,

22 Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,

23 Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado