Salmos 34

IBO

1 Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile.

2 Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị;

3 Soro m too Onyenwe anyị;

4 Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m,

5 Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe;

6 Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya;

7 Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu

8 Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma;

9 Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya,

10 Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha,

11 Ụmụ m, bịanụ gee m ntị;

12 Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya,

13 chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,

14 Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe,

15 Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,

16 ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,

17 Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;

18 Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,

19 Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu,

20 Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam.

21 Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ;

22 Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya;

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado