1 Toonu Onyenwe anyị!
2 Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem:
3 Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa
4 Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile
5 Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu;
6 Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume
7 Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ;
8 Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe;
9 Ọ na-enye ehi niile nri
10 Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya,
11 Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
12 O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma;
13 Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike,
14 Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo,
15 Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile;
16 Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ,
17 Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute.
18 Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha;
19 O kpugheela okwu ya nye Jekọb,
20 O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a.