1 Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze;
2 Ụbọchị niile ka m ga-eto gị
3 Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;
4 Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ;
5 Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị,
6 Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile,
7 Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu
8 Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko,
9 Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị;
10 O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị;
11 Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị.
12 ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche
13 Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
14 Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada
15 Olileanya ihe niile dị na gị,
16 I na-asaghepụ aka gị
17 Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi;
18 Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya,
19 Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya;
20 Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya,
21 Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị;