1 Toonu Onyenwe anyị.
2 unu ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị,
3 Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma;
4 Nʼihi na Onyenwe anyị ahọpụtala Jekọb nye onwe ya,
5 Amaara m na Onyenwe anyị dị ukwuu,
6 Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya
7 Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa.
8 O tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt,
9 O zipụrụ ihe ịrịbama ya dị iche iche na ọrụ ebube ya niile nʼetiti unu, o Ijipt,
10 O tigburu ọtụtụ mba dị ukwuu nʼọnụọgụgụ,
11 Ụfọdụ nʼime ha bụ Saịhọn, eze ndị Amọrait,
12 O weere ala ndị obodo ahụ niile nye ndị ya,
13 O Onyenwe anyị, aha gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi
14 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekpepụta ndị ya.
15 Chi ndị mba ọzọ bụ arụsị e jiri aka kpụọ,
16 Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu,
17 Ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe,
18 Ndị na-eme ha ga-adị ka ha.
19 Ndị Izrel, toonu Onyenwe anyị.
20 Unu ndị ụlọ Livayị, toonu Onyenwe anyị;
21 Ka otuto dịrị Onyenwe anyị site na Zayọn,