1 Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,
2 “Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,
3 Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,
4 Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;
5 Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị
6 Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ
7 nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,
8 Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,