1 Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị,
2 Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị,
3 Chineke anyị bi nʼeluigwe.
4 Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha,
5 Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu,
6 ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe,
7 ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka,
8 Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha.
9 Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi
10 Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi.
11 Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi
12 Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị,
13 ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,
14 Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa,
15 Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa
16 Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị,
17 Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị,
18 ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma,