1 Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ.
2 Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm;
3 Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka,
4 Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya.
5 Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi,
6 Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ,
7 Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke,
8 Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe,
9 Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha;
10 Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu,
11 Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile,
12 Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ,
13 Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa.
14 “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị,
15 Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba,
16 Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe.
17 Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ.
18 Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime;
19 Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị,
20 Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya
21 Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ,
22 A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.”
23 Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị,
24 Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ.
25 Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya
26 Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume,
27 Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya,
28 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze,
29 Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha,
30 Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ,